Omume nke Nchekwube



O Chkwu nke m, echekwube m Gị s’ike, na Ị ga-enye m, site na erere ezi-omume nke Jesu Kristi, gratia Gị n’ụwa nke a, ma ọ bụrụ na edebe m iwu Gị, Ị ga-enyeazi m otito Gị n’ụwa ọzọ, maka na I kwere m ya na nkwa, na maka na I na-emegbado nkwa Gị ekpo nile.